2 Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?
3 Abram si kwa, Le, mu ka I nēnyeghi nkpuru: le kwa, nwa-ulom bu onye nēnweta ihem.
4 Ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si, Nwoke a agaghi-enweta ihe-gi; kama onye gēsi n'afọ-gi puta, onye ahu gēnweta ihe-gi.
5 O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.
6 Ọ we kwere na Jehova; Ọ we gua ya nye ya n'ezi omume.
7 Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya.
8 Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya?