1 Ewe kesia elu-igwe na uwa, na usu-ha nile.
2 Chineke we jesia ozi-Ya n'ubọchi nke-asa, bú nke O jere; O we kwusi n'ubọchi nke-asa ahu n'ozi-Ya nile nke O jere.
3 Chineke we gọzie ubọchi nke-asa ahu, do kwa ya nsọ: n'ihi na ọ bu nime ya ka Ọ kwusiri n'ozi-Ya nile nke Chineke kereri ekè n'ije ya.
4 Ndia bu usoro okike elu-igwe na uwa mb͕e ekere ha, n'ubọchi ahu mb͕e Jehova, bú Chineke, mere uwa na elu-igwe.
5 Ma osisi ntà ọ bula nke ọhia akādighi n'uwa, ihe-ọkukú ọ bula nke ọhia akēpughi kwa: n'ihi na Jehova, bú Chineke, akēmeghi ka miri zo n'elu uwa, ọ dighi kwa madu di ilu ọlu ubi;
6 ma alulu nēsi n'ala kwugo n'elu, nēdè kwa iru nile nke ala miri.
7 Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.