1 Ndu Sera we buru ọgu arọ isi na asa: ndia bu arọ ndu Sera.
2 Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n'obi, na ikwara ya ákwá.
3 Abraham we si n'iru onye nke ya nwuru anwu bilie, gwa umu Het okwu, si,
4 Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.
5 Umu Het we za Abraham, si ya,
6 Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n'etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n'ílì ahu nke kachasi nma n'ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu