17 Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n'iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n'ọhia ahu, nke di n'ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike
18 ibu ihe-nzuta n'anya umu Het, n'etiti ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya.
19 Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n'ọb͕à ọhia Makpila ahu n'iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean.
20 Umu Het we me ọhia ahu na ọb͕à nke di nime ya ka ha guzosiere Abraham ike ibu ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì.