1 Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n'ihe nile.
2 Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:
3 m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:
4 kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.
5 Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m'nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n'ala ahu nke i siri n'ebe ahu puta?
6 Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu.