26 Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.
27 Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.
28 Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya.
29 Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà:
30 Isọ we si Jekob, Biko, kwe ka m'loda ufọdu nime ihe a nācha ọbara ọbara; n'ihi na ada-wom #mbà; n'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Edom.
31 Jekob we si, Buru uzọ rebem ọnọdu-ọkpara-gi.
32 Isọ we si, Le, mu onwem gaje inwu anwu: ọ̀ gāba-kwa-ram urù gini, bú ọnọdu-ọkpara?