4 Umundikom Midian: Ifa na Ifēa, na Hanok, na Abida, na Eldea. Ndia nile bu umu Ketura.
5 Abraham we nye Aisak ihe nile o nwere.
6 Ma umu-ndikom nke iko-ndinyom nke Abraham nwere, Abraham nyere ha onyinye di iche iche; o we si n'ebe Aisak nwa-ya nọ zilaga ha n'Iru-anyanwu, rue ala Iru-anyanwu, mb͕e ọ nọ ndu.
7 Ma ndia bu ubọchi arọ nile nke ndu Abraham nke ọ diri, ọgu arọ asatọ na arọ iri na ise.
8 Abraham we kubie ume, nwua n'ezi isi-awọ, buru agadi, ndu-ya jukwara ya afọ; ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.
9 Aisak na Ishmael, bú umu-ya, we lìe ya n'ọb͕à Makpila, n'ọhia Efron nwa Zoha onye Het, nke di n'iru Mamre;
10 bú ọhia nke Abraham zutara n'aka umu Het: n'ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya.