10 Abimelek we si, Gini bu nka i meworo ayi? ọ fọduru nwantī na otù onye nime ndi nkem gēsowori nwunye-gi dina, i gēmewo-kwa-ri ka ikpe-ọmuma biakwasi ayi.
11 Abimelek we nye ndi-ya nile iwu, si, Onye nēmetu nwoke a ma-ọbu nwunye-ya aka, aghaghi ime ka ọ nwua.
12 Aisak we gha nkpuru n'ala ahu, hu n'arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya.
13 Nwoke ahu we di uku, ọ ga n'iru, nāga n'iru n'idi uku rue mb͕e ọ di uku nke-uku:
14 ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.
15 Ma olùlù-miri nile nke ndi-orù nna-ya gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya, ndi Filistia kpochiri ha, were kwa ájá kpojue ha.
16 Abimelek we si Aisak, Si n'ebe ayi nọ la; n'ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku.