14 Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya.
15 Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n'aka-ya n'ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà:
16 ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n'aka-ya abua na n'olu-ya ebe aji nādigh:
17 o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n'aka, bú nke o doziri.
18 O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam?
19 Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.
20 Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem.