21 Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya.
22 Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ.
23 Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya.
24 Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya.
25 Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua.
26 Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam.
27 Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si,Le, ísì nwamDi ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro: