26 Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam.
27 Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si,Le, ísì nwamDi ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro:
28 Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe,Na ufọdu nime ebe di urù nke ala,Na ọka na manya-vine ọhu ri nne:
29 Ka ndi di iche iche fè gi,Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi:Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi,Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi:Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu,Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.
30 O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata.
31 Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.
32 Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ.