4 sierem nri utọ, dika nke m'huru n'anya, butekwara m, ka m'we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua.
5 Ma Rebeka nānu ya mb͕e Aisak gwara Isọ, bú nwa-ya, okwu. Isọ we je ọhia ichuta anu-nchuta, na iweta ya.
6 Rebeka we gwa Jekob, bú nwa-ya, okwu, si Le, anurum nna-gi ka ọ nāgwa Isọ nwanne-gi okwu, si,
7 Wetaram anu-nchuta, sierem nri utọ, ka n'we rie, gọzi kwa gi n'iru Jehova tutu ọnwum.
8 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n'iwu si di.
9 Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n'ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m'gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n'anya:
10 i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.