10 Jekob we pua na Bia-sheba, nēje Heran.
11 Ọ biarue n'otù ebe, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu, n'ihi na anya-nwu adawo; ọ were otù nime nkume nke ebe ahu, dọba n'okpuru isi-ya, we dina n'ebe ahu
12 Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.
13 Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;
14 nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.
15 Ma, le, Mu onwem nọyere gi, M'gēdebe kwa gi n'ebe ọ bula i nēje, M'gēme kwa ka i lata n'ala nka; n'ihi na M'gaghi-arapu gi, rue mb͕e m'gēmewori ihe M'gwaworo gi okwu bayere ya.
16 Jekob we teta n'ura-ya, si, N'ezie Jehova nọ n'ebe a; ma mu onwem amaghi ya.