14 Leban we si ya, N'ezie ọkpukpum na anu-arum ka i bu. Ya na ya we nọ ogologo otù ọnwa.
15 Leban we si Jekob, Ọ̀ bu n'ihi na nwa-nnem ka i bu na i gēfèm n'efu? gosim, gini gābu ugwọ-ọlu-gi?
16 Ma Leban nwere umu-ndinyom abua: aha nke-okenye bu Lia, aha nke-ntà bu Rechel.
17 Anya Lia esighi ike; ma Rechel mara nma n'aru ma kwa nma ile anya.
18 Jekob we hu Rechel n'anya; ọ si, M'gēfè gi arọ asa n'ihi Rechel, bú nwa-gi nwayi nke-ntà.
19 Leban we si, Ọ di nma ka m'nye gi ya, kari were ya nye nwoke ọzọ: nọyerem.
20 Jekob we fè òfùfè n'ihi Rechel arọ asa; ha di n'anya-ya dika ubọchi ole-na-ole, n'ihi ihu-n'anya o ji hu ya.