1 Ma mb͕e Rechel huru na ọ mughi umu nye Jekob, Rechel we kwo nwa-nne-ya nwayi ekworo. ọ si Jekob, Nyem umu, ma ọ buru na inyeghm, onye nwuru anwu ka m'bu.
2 Iwe Jekob we di ọku megide Rechel: ọ si, Ọ̀ bu n'ọnọdu Chineke ka m'nọ, Onye b͕ochiworo gi nkpuru nke afọ?
3 Rechel we si, Le, orùm nwayi Bilha, bakuru ya, ka ọ we mua nwa n'ikperem abua, ewe site kwa na ya wuliem elu dika ulo, ọbuná mu onwem.
4 Ọ nye ya Bilha na nwunye, bú nwayi nējere ya ozi: Jekob we bakuru ya.
5 Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.
6 Rechel we si, Chineke ekpeputawom, ọzọ kwa, ọ nuwo olum, we nyem nwa-nwoke: n'ihi nka ka ọ kpọrọ aha-ya Dan.
7 Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi, we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.