11 Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.
12 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.
13 Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.
14 Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi.
15 Ọ we si ya, Ọ̀bu okwu ntà na i narawo dim? ì gānara kwa mandrake nwam? Rechel we si, N'ihi nka gi na ya gēdina n'abali a n'ihi mandrake nwa-gi.
16 Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu,
17 Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.