16 Jekob we si n'ọhia bata n'anyasi, Lia we pua izute ya, si, Mu ka i gābakute; n'ihi na achiriwom mandrake nwam gota gi n'ezie. Ọ we dinayere ya n'abali ahu,
17 Chineke we ge Lia nti, ọ we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke nke-ise.
18 Lia we si, Chineke enyewom ugwo-ọlum, n'ihi na enyerem dim nwayi nējerem ozi' o we kpọ aha-ya Isaka.
19 Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi.
20 Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun.
21 Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.
22 Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.