19 Lia we turu ime ọzọ, muara Jekob nwa-nwoke nke-isi.
20 Lia we si, Chineke enyewom ezi onyinye; mb͕e a dim gēbiyerem, n'ihi na amuworom ya umu-ndikom isi: ọ we kpọ aha-ya Zebulun.
21 Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.
22 Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.
23 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam:
24 ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ.
25 O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam.