21 Emesia ọ mu-kwa-ra nwa-nwayi, kpọ aha-ya Daina.
22 Ma Chineke chetara Rechel, Chineke we ge ya nti, meghe àkpà-nwa-ya.
23 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke, si, Chineke ekpochapuwo ita-utam:
24 ọ we kpọ aha-ya Josef, si, Ka Jehova tukwasirim nwa-nwoke ọzọ.
25 O rue, mb͕e Rechel musiri Josef, Jekob siri Leban, Zilagam, ka m'we la n'ebem, na n'alam.
26 Nyem ndinyom na umum ndi m'fèworo gi òfùfè n'ihi ha, ka m'la kwa: n'ihi na gi onwe-gi amawo òfùfèm nke m'fèworo gi.
27 Leban we si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nọgide: n'ihi na aribawom ama na Jehova agọziwom n'ihi gi.