8 Rechel we si, Nb͕a Chineke ka mu na nwa-nnem nwayi b͕aworo, enwewokwam ike: o we kpọ aha-ya Naftali.
9 Mb͕e Lia huru na ọ kwusiri imu nwa, ọ were Zilpa, bú nwayi nējere ya ozi, nye Jekob na nwunye.
10 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke.
11 Lia we si, Enwerem isi-ọma! ọ we kpọ aha-ya Gad.
12 Zilpa, bú nwayi nējere Lia ozi, we muara Jekob nwa-nwoke nke-abua.
13 Lia we si, Na mb͕e ọ nāgaram nke-ọma! n'ihi na umu-ndinyom madu akpọwom onye ihe nāgara nke-ọma: ọ we kpọ aha-ya Asha.
14 Reuben we je na mb͕e obìbì ọka wheat, chọta mandrake n'ọhia, chita ha nye Lia nne-ya. Rechel we si Lia, Biko, nyem ufọdu nime mandrake nwa-gi.