1 Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.
2 Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n'ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga.
3 Jehova we si Jekob, Laghachi n'ala nna-gi-hà, laghachikuru umu-nna-gi; M'gānọyekwara gi.
4 Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,
5 ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.
6 Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu.