18 ọ we dupu anu-ulo-ya nile, na àkù-ya nile ọ kpatara, bú anu-ulo o nwetara, nke ọ kpatara na Padan-eram, ilakuru Aisak nna-ya rue ala Kenean.
19 Ma Leban jere ikpacha aji ìgwè ewu na aturu-ya: Rechel we zue teraphim nke nna-ya nwere n'ori.
20 Jekob we ghọb͕ue Leban onye Siria, n'ighara igosi ya na ya nāb͕alaga.
21 Ọ we b͕alaga, ya onwe-ya na ihe nile ọ nwere; ọ we bilie, gabiga Osimiri Yufretis, che iru-ya n'ugwu Gilead.
22 Ewe gosi Leban n'ubọchi nke-atọ na Jekob b͕alagarari.
23 Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.
24 Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.