23 Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.
24 Chineke we biakute Leban onye Siria nime nrọ abali, si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.
25 Leban we rue Jekob aru. Ma Jekob marari ulo-ikwū-ya n'ugwu ahu: Leban na umu-nne-ya makwara ulo-ikwū-ha n'ugwu Gilead.
26 Leban we si Jekob, Gini bu ihe i mere, na i ghọb͕uwom, dupu kwa umum ndinyom dika ndinyom eji mma-agha dọta n'agha?
27 N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?
28 ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka inekweghim ka m'sutu umum ndikom na umum ndinyom ọnu? ub͕u a i mewo ihe-nzuzu.
29 Ọ diri ike akam imejọ unu: ma Chineke nke nna-unu gwaram okwu n'abali nyahuru, si, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ikpayere Jekob uka, ma-ọbu nke di nma ma-ọbu nke jọrọ njọ.