34 Ma Rechel wereri teraphim ahu, tinye ha nime ihe eji anọkwasi camel, we nọkwasi ha. Leban we bitu ulo-ikwū ahu nile aka, ma ọ chọtaghi ha.
35 Rechel we si nna-ya, Ya abula ihe iwe iwe di ọku n'anya onye-nwem na apughm ibili n'iru gi; n'ihi na ọ dim dika ọ nādi ndinyom. Ọ we chọsie ike, ma ọ chọtaghi teraphim ahu.
36 Jekob we we iwe di ọku, so Leban se okwu: Jekob we za, si Leban, Gini bu njehiem? gini bu nmehiem, na i chuworom n'ọku ọku?
37 Ọ bu ezie na i bituwo ihem nile aka, ma gini ka i chotaworo nime ihe nile nke ulo-gi? Tọb͕ọ ya ebe a n'iru umu-nnem na umu-nne-gi, ka ha we kpezie n'etiti ayi abua.
38 Orú arọ a ka mu onwem nọyeworo gi; nne-aturu-gi na nne-ewu-gi amukwoghi umu, erighkwa m ebulu nke ìgwè ewu na aturu-gi.
39 Nke anu-ọhia dọb͕uru, ewetaghi m ya nye gi; mu onwem nēdochi ya; site n'akam ka i nāchọ ya, ma-ọbu ihe ezuru n'ehihie ma-ọbu ihe ezuru n'abali.
40 Otú a ka m'nọworo; n'ehihie ọkpukpọ-nku ririm, ọtutu-oyi rikwara m n'abali; uram we fepu n'anyam abua.