44 Ma ub͕u a bia, ka ayi b͕a ndu, mu na gi; ọ gābu kwa ihe-àmà n'etiti mu na gi.
45 Jekob we were nkume, guzo ya ka ọ buru ogidi.
46 Jekob we si umu-nne-ya, Chikọtanu nkume; ha we were nkume me obo: ha we rie nri n'ebe ahu n'akuku obo ahu.
47 Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.
48 Leban we si, Obo a bu ihe-àmà n'etiti mu na gi ta. N'ihi nka akpọrọ aha-ya Galeed:
49 na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ.
50 Ọ buru na i weda umum ndinyom n'ala, ọ buru kwa na i kuru ndinyom tiyere umum ndinyom, ọ dighi onye ayi na ya nọ; le Chineke bu onye-àmà n'etiti mu na gi.