5 Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.
6 Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala.
7 Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala.
8 Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem.
9 Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.
10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.
11 Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.