9 Isọ we si, Enwerem ri nne; nwa-nnem, ya diri gi, bú nke i nwere.
10 Jekob we si, É-è, biko, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, gi nara kwa n'akam onyinyem inata iru-ọma: n'ihi na ahuwom iru-gi dika anāhu iru Chineke, ihem we tọ gi utọ.
11 Biko, nara ngọzim nke ewetaworo gi; n'ihi na Chineke emewom amara, na n'ihi na enwerem ihe nile. O rugide ya, ọ we nara ya.
12 Ọ si, Ka ayi bulie ije, ka ayi la, ka m'je kwa n'iru gi.
13 Ọ si ya, Onye-nwem amawo na umum adighi ike, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nke nēnye umu ara di kwa n'akam: ọ buru na achusie ha ike otù ubọchi, ìgwè ewu na aturu nile gānwu kwa,
14 Biko, ka onye-nwem gabiga n'iru orù-ya: ma mu onwem, ka m'nēdu ha nwayọ nwayọ, dika ije-ukwu anu-ulo nke di n'irum, na dika ije-ukwu nke umum si di, rue mb͕e m'gābiakute onye-nwem rue Sia.
15 Isọ we si, Biko, ka m'chiri madu ufọdu nime ndi mu na ha yikọrọ bia, debe n'ebe i nọ. Ọ si, N'ìhi gini kwa? ka m'huta amara n'iru onye-nwem.