14 Jekob we guzo ogidi ọtọ n'ebe ahu ebe Ọ kpayere ya uka, bú ogidi nkume: ọ wusi àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya, wusa kwa manu n'elu ya.
15 Jekob we kpọ aha ebe ahu ebe Chineke kpayere ya uka Bet-el.
16 Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa.
17 O rue, mb͕e ime nēmesi, ya ike, na nwayi nke nēle ime siri ya, Atula egwu; n'ihi na nka bu kwa nwa-nwoke i gēnwe.
18 O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.
19 Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).
20 Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta.