22 O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:
23 umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:
24 umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:
25 umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:
26 umu-ndikom Zilpa, bú nwani nējere Lia, ozi; Gad na Asha: ndia bu umu-ndikom Jekob, nke amuru nye ya na Padan-eram.
27 Jekob we biakute Aisak, bú nna-ya, na Mamre, bú Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), ebe Abraham na Aisak nọrọ dika ọbìa.
28 Ubọchi Aisak we buru ọgu arọ iteghete.