31 Ndia bu eze ndi bu eze n'ala Edom, tutu eze ọ bula bu eze umu Israel.
32 Bela nwa Beoa bu eze n'Edom; aha obodo-ya bu Dinhaba.
33 Bela we nwua, Jobab nwa Zera, nke sitere na Bozra, we buru eze n'ọnọdu ya.
34 Jobab we nwua, Husham, nke sitere n'ala ndi Timan, we buru eze n'ọnọdu ya.
35 Husham we nwua, Hedad nwa Bedad, onye tib͕uru Midian n'ọhia Moab, we buru eze n'ọnọdu ya: aha obodo-ya bu Avit.
36 Hedad we nwua, Samla, nke sitere na Masrika, we buru eze n'ọnọdu ya.
37 Samla we nwua, Shaul, nke sitere na Rehobot n'usọ Osimiri, we buru eze n'ọnọdu ya.