8 Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.
9 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia.
10 Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.
11 Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.
12 Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.
13 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
14 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora.