15 Otù nwoke we hu ya, ma, le, ọ nāwaghari n'ọhia: nwoke ahu we jua ya, si, Gini ka i nāchọ?
16 Ọ si Umu-nnem ka m'nāchọ: biko, gosim ebe ha nāzù ewu na aturu.
17 Nwoke ahu we si, Ha esiwo n'ebe a bulie ije: n'ihi na anurum ka ha nāsi, K'ayi je Dotan. Josef we so umu-nne-ya, chọta ha na Dotan.
18 Ha we hu ya n'ebe di anya, ma tutu ọ biakute ha nso, ha b͕agide ya ìzù ọjọ ime ka ọ nwua.
19 Ha we sìrita onwe-ha, Le, ọ̀kà-nrọ a nābia.
20 Ma ub͕u a, bianu, ka ayi b͕ue ya, tubà ya n'otù nime olùlù ndia, ayi gāsi kwa, Ajọ anu eriwo ya: ayi gāhu kwa ihe nrọ-ya nile gābu.
21 Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya.