2 Ndia bu osuso-ọmumu Jekob. Mb͕e Josef b͕ara arọ iri na asa, ọ nāzù ìgwè ewu na aturu, ya na umu-nne-ya; ya onwe-ya bu nání nwata, ya na umu Bilha na umu Zilpa, bú ndinyom nna-ya, yikọrọ zù ewu na aturu: Josef we wetara nna-ha akukọ ihe ọjọ ha.
3 Ma Israel huru Josef n'anya kari umu-ya nile, n'ihi na nwa agadi-ya ka ọ bu: o we mere ya uwe-nwuda nwere aka.
4 Umu-nne-ya we hu na ọ bu ya onwe-ya ka nna-ha huru n'anya kari umu-nne-ya nile; ha we kpọ ya asì, ha apughi kwa igwa ya okwu n'udo.
5 Josef we rọ nrọ, gosi ya umu-nne-ya: ha we kpọ ya asì ọzọ kari.
6 Ọ si ha, Biko, nurunu nrọ a nke m'rọworo:
7 ma, le, ayi onwe-ayi nēke ùkwù-ọka n'etiti ubi, ma, le, ùkwù-ọka nkem biliri, guzo kwa onwe-ya ọtọ; ma, le, ùkwù-ọka-unu nāb͕a gburugburu, kpọ isi ala nye ùkwù-ọka nkem.
8 Umu-nne-ya we si ya, Ì gābu eze-ayi n'ezie? ma-ọbu ì gāchi ayi n'ezie? Ha we kpọ ya asì ọzọ kari n'ihi nrọ-ya nile, na n'ihi okwu-ya nile.