17 ufọdu nime ihe-oriri nile nke Fero nke osi ite nēsi di kwa na nkata nke kachasi elu; anu-ufe nēri kwa ha site na nkata ahu n'elu isim.
18 Josef we za, si, Nka bu akukọ-isi-ya: nkata atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;
19 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.
20 O rue, n'ubọchi nke-atọ, nke bu ubọchi ncheta ọmumu Fero, na o mere oké oriri nye ndi-orù-ya nile: o welie isi onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu na isi onye-isi ndi-osi-ite n'etiti ndi-orù-ya.
21 O me ka onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu lata n'ọnọdu-obu-ihe-ọṅuṅu-ya; o we nye iko n'aka Fero:
22 ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha.
23 Ma onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu echetaghi Josef, kama o chezọrọ ya.