22 M'we hu na nrọm, ma, le, oko ọka asa nāwaputa n'otù ókpòrò, ha soro nkpuru, di kwa nma:
23 ma, le, oko ọka asa, nke kpọnwuru akpọnwu, nke fikpọ-kwa-ra afikpọ, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọ-kwa-ra, nēpuso ha n'azu:
24 oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya.
25 Josef we si Fero, Nrọ, Fero, otù ka ọ bu: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka O gosiworo Fero.
26 Ezi ehi asa ahu, arọ asa ka ha bu; ezi oko ọka asa ahu, arọ asa ka ha bu kwa: nrọ ahu, otù ka ọ bu.
27 Ehi asa ahu nke tara aru, nke jọ-kwa-ra njọ, nke nārigoputa n'azu ha, arọ̄ asa ka ha bu, ha na oko ọka asa ahu nke di efù, nke ifufe Iru-anyanwu chakpọrọ; ha gābu arọ asa nke oké unwu.
28 Nke ahu bu okwu nke m'gwara Fero: ihe nke Chineke gaje ime, nke ahu ka Ọ mere ka Fero hu anya.