41 Fero we si Josef, Le, edowom i onye-isi ala Ijipt nile.
42 Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya,
43 me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile.
44 Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n'ala Ijipt nile.
45 Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt.
46 Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile.
47 N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne.