44 Fero we si Josef, Mu onwem bu Fero, asi kwa na i nọghi ya ọ dighi onye ọ bula gēweli aka-ya ma-ọbu ukwu-ya n'ala Ijipt nile.
45 Fero we kpọ aha Josef Zafenat-pania; o nye ya Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, na nwunye. Josef we pua jeghari n'ala Ijipt.
46 Josef b͕ara orú arọ na iri mb͕e o guzoro n'iru Fero eze Ijipt. Josef we si n'iru Fero pua, gabiga n'ala Ijipt nile.
47 N'arọ asa ahu nke anēriju afọ ala we nēme nri ri nne.
48 O we chikọta ihe-oriri nile nke arọ asa ahu nke di n'ala Ijipt, tiye ihe-oriri ahu n'obodo nile: ihe-oriri nke ubi nke obodo ọ bula nke di ya gburugburu ka o tiyere n'etiti ya.
49 Josef we kwakọba ọka dika ájá nke oké osimiri, nēme ka ọ ba uba nke-uku, rue mb͕e ọ rapuru igu ya ọnu; n'ihi na ọ dighi nguta.
50 Amuru umu-ndikom abua nye Josef tutu arọ oké unwu abia, ndi Asenat nwa-nwayi Poti-fera, bú onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.