7 Oko ọka asa nke fikpọrọ afikpọ we loda oko ọka asa ahu nke buru ibu so kwa nkpuru. Fero we teta, ma, le, ọ bu nrọ.
8 O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.
9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu we gwa Fero okwu, si, Nmehiem nile ka mu onwem nēhota ta:
10 Fero were iwe n'aru ndi-orù-ya, tinye m n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-isi ndi-ob͕ū, mu na onye-isi ndi osi ite:
11 ayi we rọ nrọ n'otù abali, mu na ya; onye ọ bula dika akukọ-isi nrọ-ya si di, otú a ka ayi rọrọ.
12 Ma ayi na otù okorọbia nọ n'ebe ahu, bú onye-Hibru, orù onye-isi nke ndi-ob͕ū nwere; ayi we kọrọ ya, ọ we kọrọ ayi isi nrọ-ayi; onye ọ bula n'etiti ayi dika nrọ-ya si di ka ọ kọrọ isi nrọ nye.
13 O rue na, dika ọ kọrọ isi nrọ nye ayi, otú a ka ọ di; mu ka ọ mere ka m'lata n'ọnọdum, ma ya ka ọ kwugburu.