23 Ma ha onwe-ha amaghi na Josef nānu ihe ha nēkwu; n'ihi na onye-nsughari nọ n'etiti ha.
24 O we si n'ebe ha nọ chighari onwe-ya, kwa, ákwá; o we laghachikute ha, gwa ha okwu, si n'etiti kuru Simeon, ke ya ab͕u n'iru anya-ha.
25 Josef we nye iwu, ha we kpojue ihe nile ha n'ọka, o nye kwa iwu inyeghachi ego-ha, nke onye ọ bula n'akpa-ya, na inye ha ihe ha gēri n'uzọ: ewe mere ha otú a.
26 Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.
27 Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya.
28 Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n'akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n'etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi?
29 Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si,