26 Ha were ọka-ha bo inyinya-ibu-ha, si n'ebe ahu la.
27 Otù nime ha we meghe akpa-ya inye inyinya-ibu-ya nri-anu-ulo n'ebe inọ ọnọdu-abali, ọ we hu ego-ya; ma, le, ego ahu di n'ọnu akpa-ya.
28 Ọ si umu-nne-ya, Enyeghachiwo egom; ọzọ kwa, le, ọ di n'akpam: obi-ha we fepu, ha we nāmarita jijiji n'etiti onwe-ha, si, Gini bu nka Chineke meworo ayi?
29 Ha we biakute Jekob nna-ha, rue ala Kenean, gosi ya ihe nile dakwasiri ha; si,
30 Nwoke ahu, bú onye-nwe ala ahu, kpayere ayi uka ike, tiye ayi n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ dika ndi-nledo ala.
31 Ayi we si ya, Ndi ziri ezi ka ayi bu, ayi abughi ndi-nledo:
32 umu-nne iri na abua ka ayi bu, umu nke nna-ayi; otù anọghi ndu, nke-ntà di kwa n'aka nna-ayi taa n'ala Kenean.