16 Josef we hu Benjamin n'etiti ha, ọ si onye bu onye-isi ulo-ya, Me ka ndikom ahu bata n'ulo, gi b͕u kwa anu, dozie ihe; n'ihi na mu ka ndikom ahu gēso ri ihe n'etiti-ehihie.
17 Nwoke ahu we me dika Josef siri ya; nwoke ahu we me ka ndikom ahu bata n'ulo Josef.
18 Ndikom ahu we tua egwu, n'ihi na emere ka ha bata n'ulo Josef; ha si, Ọ bu n'ihi ego ahu, nke enyeghachiri n'akpa-ayi na mmalite, ka anēme ka ayi onwe-ayi bata; ka ọ we chọ ayi okwu, dakwasi ayi, were ayi ibu ndi-orù, were kwa inyinya-ibu-ayi.
19 Ha we biakute nwoke ahu nso, nke bu onye-isi ulo Josef, ha gwa ya okwu n'ọnu-uzọ ulo ahu,
20 si, Biko, onye-nwem, ayi rida-tara n'ezie na nmalite izuru ihe-oriri:
21 o rue, mb͕e ayi biara n'ebe inọ ọnọdu-abali, na ayi meghere akpa-ayi, ma, le, ego onye ọ bula di n'ọnu akpa-ya, bú ego-ayi n'ọtùtù-ya zuru okè; ayi ewe-ghachiwo ya n'aka-ayi.
22 Ọ di kwa ego ọzọ ayi wedataworo n'aka-ayi izuru ihe-oriri: ayi amaghi onye tiyere ego-ayi n'akpa-ayi.