1 Israel we bulie ije, ya na ndi nile o nwere, ọ biarue Bia-sheba, chuara Chineke nke nna-ya Aisak aja.
2 Chineke we gwa Israel okwu n'ọhù nke abali, si, Jekob, Jekob. Ọ si Lekwam.
3 Ọ si, Mu onwem bu Chineke, bú Chineke nke nna-gi: atula egwu irida n'Ijipt; n'ihi na mba uku ka M'gēme gi ka i ghọ n'ebe ahu.
4 Mu onwem gēso gi rida n'Ijipt; ọ bu kwa Mu onwem gēme ka i rigota kwa n'ezie: Josef gātukwasi kwa aka-ya n'anya-gi abua.
5 Jekob we si na Bia-sheba bilie: umu Israel we buru Jekob, bú nna-ha, na umu-ntakiri-ha, na nwunye nile ha, n'ub͕ọ-ala nke Fero zitereri ibu ya.