25 Ha si, I debewo ayi ndu: ka ayi huta amara n'iru onye-nwem, ayi gāghọrọ Fero ndi-orù.
26 Josef we me ya ka ọ buru ukpuru bayere ala nke Ijipt rue ta, na Fero gēnwe otù uzọ n'uzọ ise; nání ala ndi-nchu-àjà nwere iche nāghọghi ihe Fero nwere.
27 Israel we biri n'ala Ijipt, n'ala Goshen; ha we nwe ihe-onwunwe nime ya, mu kwa ọmùmù, ba uba nke-uku.
28 Jekob we di ndu n'ala Ijipt arọ iri na asa: ubọchi Jekob, bú arọ ndu-ya, we di ọgu arọ asa na asa.
29 Ubọchi Israel gānwu we rue nso: ọ kpọ nwa-ya Josef, si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum, me-kwa-ram ebere na ezi-okwu; biko, elìlam n'Ijipt:
30 kama mu na nnam-hà gēdina, i gēsi kwa n'Ijipt bupum, lìkwam n'ílì-ha. Ọ si, Mu onwem gēme dika okwu-gi si di.
31 Ọ si, Ṅuaram iyi: o we ṅuara ya iyi. Israel we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.