10 Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha.
11 Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi.
12 Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala.
13 Josef we chiri ha abua, Efraim n'aka-nri-ya n'ebe aka-ekpe Israel di, na Manase n'aka-ekpe-ya n'ebe aka-nri Israel di, ọ we me ka ha biakute ya nso.
14 Israel we setia aka-nri-ya tukwasi ya n'isi Efraim, onye bu nke-ntà, na aka-ekpe-ya n'isi Manase, nātub͕a aka-ya abua; n'ihi na Manase bu ọkpara.
15 Ọ we gọzie Josef, si, Chineke ahu, Nke nnam-hà, bú Abraham na Aisak, nējeghari n'iru Ya, Chineke ahu Nke nāzùm ogologo ogem rue taa,
16 Mọ-ozi ahu Nke nāb͕aputam n'aka ihe ọjọ nile, Ya gọzie umu-okoro ndia; ka akpọ kwa n'isi ha aha nkem, na aha nnam-hà, bú Abraham na Aisak; ka ha ba kwa uba rue ọtutu madu n'etiti uwa.