5 Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere.
6 Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha.
7 Ma mu onwem, mb͕e m'siri na Padan bia, Rechel nwuru n'akukum n'ala Kenean n'uzọ, mb͕e uzọ foduru ibiaru Efrat: m'we lìe ya n'ebe ahu n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).
8 Israel we hu umu-ndikom Josef, ọ si Òle ndi bu ndia?
9 Josef we si nna-ya, Umum ka ha bu, ndi Chineke nyeworom n'ebe a. Ọ si, Biko, chitaram ha, m'gāgọzi ha.
10 Ma anya Israel di arọ́ site n'agadi ọ bu, ọ pughi ihu uzọ. O me ka ha biakute ya nso; o we sutu ha ọnu, b͕akua ha.
11 Israel we si Josef, Echeghm ihu iru-gi: ma, le, Chineke emewo ka m'hu kwa nkpuru-gi.