16 Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17 Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.
18 Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19 Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20 Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.
21 Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.
22 Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.