3 Adam we di ndu ọgu arọ isi na iri, ọ mua nwa n'oyiyi-ya, dika onyinyo-ya si di; ọ kpọ aha-ya Set:
4 ubọchi nile nke Adam, mbe ọ musiri Set, bu nnù arọ abua: ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom.
5 Ubọchi nile nke Adam di ndu we buru nnù arọ abua na ọgu isi na iri: o we nwua.
6 Set di ndu ọgu arọ ise na ise, ọ mua Enosh:
7 Set di ndu, mb͕e ọ musiri Enosh, nnù arọ abua na asa, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
8 ubọchi nile nke Set we buru nnù arọ abua na ọgu ise na iri na abua: o we nwua.
9 Enosh di ndu ọgu arọ anọ na iri, ọ mua Kenan: