4 Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.
5 Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile.
6 Jehova we chegharia na O mere madu n'uwa, ọ we wute Ya n'obi-Ya.
7 Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha.
8 Ma Noa hutara amara n'iru Jehova.
9 Ndia bu osuso-ọmumu Noa. Noa bu onye ezi omume, onye zuru okè n'ọb͕ọ-ya nile: Noa na Chineke yikọrọ nējeghari.
10 Noa we mua umu-ndikom atọ, Shem, na Ham, na Jefet.