11 N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.
12 Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.
13 N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu;
14 ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula.
15 Ha we bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya.
16 Ndi nāba n'ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n'anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.
17 Iju-miri ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n'elu uwa bulie ya elu.