21 Anu-aru nile nke nākpu akpu n'elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, na madu nile ọ bula:
22 ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.
23 O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n'elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n'uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n'ub͕ọ ahu.
24 Miri we di ike n'elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.